Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 28:19

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!
6 Ụbọchị
Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

Akwụkwọ Nsọ dị Ndụ
Ụbọchị 7
Kemgbe mmalite oge, okwu Chineke na-eweghachi obi na uche mmadụ - ma Chineke ka nọ n'ọlụ. N'ime ihe ọgụgụ ụbọchị asaa a pụrụ iche, ka anyị too Chineke maka ike n"enwogha ndụ dị na Akwụkwọ Nsọ site na ileba anya n'otú Chineke si eji Akwụkwọ Nsọ emetụta akụkọ ihe gara aga ma gbanwee ndụ mmadụ na mpaghara ụwa.

Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi Abụọ
Ụbọchị Iri
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.