Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 28:17

Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

Mgbe Okwukwe Darà Mbà: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi Abụọ
Ụbọchị Iri
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwerè ike ịdị nnukwu nnoro-onwe na enweghí mmadu. Ụfọdụ nà-ata ahụhụ ná agbachí nkịtị, ebe ndị ọzọ nà-ahapụ nkwenye kpamkpam, n'echè na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyerè na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwà nke ana aghọtaghị ofuma. Ọ nà-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ nà-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri.