Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 1:22
![Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị Anọ](/_next/image?url=https%3A%2F%2F%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F22860%2F640x360.jpg&w=1920&q=75)
Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị Anọ
Ụbọchị Anọ
Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.
![Onyinye nke Ekeresimesi](/_next/image?url=https%3A%2F%2F%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F29131%2F640x360.jpg&w=1920&q=75)
Onyinye nke Ekeresimesi
Ụbọchị Anọ
Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.
![Akụkọ Ekeresimesi](/_next/image?url=https%3A%2F%2F%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F49%2F640x360.jpg&w=1920&q=75)
Akụkọ Ekeresimesi
Ụbọchị 5
Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.
![Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi](/_next/image?url=https%3A%2F%2F%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F26%2F640x360.jpg&w=1920&q=75)
Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.