Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara LUK 2:15

Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị Anọ
Ụbọchị Anọ
Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.

Akụkọ Ekeresimesi
Ụbọchị 5
Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.

Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge Ezumike
Ụbọchị ise
Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị na-eme mgbe oge ezumike adighị abu nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ a pụrụ iche ewepụtara maka ogụgụ ga-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otu esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru uju. Igodo: gbasara gbasara https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1 https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1.

Ntụgharị-Uche Gasị Nke Ekeresimesi
Ụbọchị Ise
Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.

Ihe Kpatara Ejiri Mụọ Jizọs
Ụbọchị Ise
Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.

Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ Ekeresimesi
Ụbọchị Asaa
Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.

EKERESIMESI: Mmezù Atụmatụ Chineke Maka Nnapụta
Ụbọchị Iri Na Anọ
Chi ụgha ihe a kpọrọ mmadụ chepụtara iji kọwaa chi ha maara na ọ ga-adịrịrị, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ. Ha bụ chi ndị eji òfùfè na inye ihe rịọ ka ha legodi anyị anya. Mana Chi ahụ naanị Ya bụ Ezi Chi ebula ụzọ malite wee na-achọ anyị––ịnapụta anyị wee kpọghachi anyị azụ na Onwe-Ya. Nke ahụ bụ akụkọ Ekeresimesi.

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.