Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JENESIS 3:15

Chineke Bụ̀ _______
Ụbọchị Isii
Ònyé ka Chineke bụ̀? Anyị niile nwerè azịza dị iche iche, mana olee otu anyị gà-esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwerè ebe Chineke nọ, gị na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gị na ndị ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—Chi dị irè, dị adị, na dị njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị isii n'eso usoro ozizi Ụkọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke Bụ̀ _______.

Obi Niile Nke Agụụ N'agụ
Ụbọchị Asaa
Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.