Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ỌPUPU 3:4

Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị Anyị
Ụbọchị Ise
Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.

Ọkpụkpọ oku Ndúzi Na-eje ozi
5 Ụbọchị
Akpọrọ anyị ka anyị n’edu dịka Jisọs mere. Iduzi na-amalite site na mmadụ, ọ bụghị ọkwa. Ebumnuche idu ndú bụ ịkwaga ndị Chineke n’ime nzube Ya. Ọgụgụ ndị a kwa ụbọchị ga-enyere gị aka ịtọ ntọala siri ike na ọnọdụ nduzi gị, na-echetara gị na tupu ị bụrụ onye ndu, ị bụ odibo, tupu ị bụrụ odibo, ị bụ nwa Chineke hụrụ n’anya.

Mgbe Okwukwe Darà Mbà: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi Abụọ
Ụbọchị Iri
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwerè ike ịdị nnukwu nnoro-onwe na enweghí mmadu. Ụfọdụ nà-ata ahụhụ ná agbachí nkịtị, ebe ndị ọzọ nà-ahapụ nkwenye kpamkpam, n'echè na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyerè na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwà nke ana aghọtaghị ofuma. Ọ nà-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ nà-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri.