Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI EFESỌS 5:22
Alụmdi na Nwunye dịka Chineke si Zube
3 Ụbọchị
Ma ị lụọla di maọbụ nwunye maọbụ na ị ka chọrọ ịlụ alụ, atụmatụ ịgụ akwụkwọ ụbọchị atọ a ga-enyere gị aka ịchọpụta ezigbo atụmatụ Chineke maka ofufe nrù ndụ niile nke di na nwunye. Mụta ka esi ele enyo ịhụnanya Jizọs nwere maka nwunye ya, bụ Nzukọ nsọ, site n'ịchọgharị isiokwu nke mmekọrịta, ịmụ nnwa, mkpọsa, ịdị ọcha na ihe ụtọ.
Ịhụnanya na Alụmdi-Na-Nwunye
Ụbọchị Ise
Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enye Chineke ohere ikpughe nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a na-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta ụka na ekpere gị na onye i lụrụ ga n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu na mmekọrịta gị dị ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church
Ịlụ Di na Nwunye
Ụbọchị Ise
Alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta nke mmadụ ga-agabiga ihe siri ike gasị na ya mana uru dị na ya riri nne, ọ bụkwanụ ọtụtụ mgbe ka anyị na-echefu na "E kwenyere m" bụ nanị mmalite yabụ ije. Otu o si daba nke ọma, Akwụkwọ Nsọ nwere ọtụtụ ihe ikwú banyere alụmdi na nwunye otu di na nwunye si ele yabụ mmekọrịta anya. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị nkenke ị ga-ezute ụbọchị ọ bụla nke atụmatụ ihe ọgụgụ a, ka emebere iji nyere gị aka itolite na nghọta gị maka atụmatụ Chineke nye alụmdi na nwunye—na ime ka mmekọrịta gị na onye i lụrụ mikwuo emi ka ị n'agụ atụmatụ ihe ọgụgụ a.
Nkwa Ahụ
Ubọchị 6
N'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ndi Life.Church a, di na nwunye isii na -ede maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha na -ekwughi n'ihu ọha ebe ịchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, mmekọ, ịdị ọcha na ekpere bụ nkwa na -eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na -eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ