Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI EFESỌS 2:4

Jizọs, Achọrọ M Gị!
Ụbọchị Atọ
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀
Ụbọchị Isii
N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.