Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI KỌLỌSI 3:12
Ịhụnanya na Alụmdi-Na-Nwunye
Ụbọchị Ise
Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enye Chineke ohere ikpughe nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a na-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta ụka na ekpere gị na onye i lụrụ ga n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu na mmekọrịta gị dị ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church
Igbaghara ndi n'emerụ anyi ahụ
Ụbọchị asaa
Ma ànyị na-enwe mmerụ nke mmetụta uche ma ọ bụ mmerụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebi m ndụ Ndị Kraịst. Jizọs Kraịst nwetara ụdị mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a n'awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.
Amamịghe Omimi: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị Nna
Ụbọchi Asaa
Ọ si n’uche mmadu puta etu nna anyị si akpụzi anyị. Onweghi onye na-agbanahụ ikike nke nna ha nke ụwa. Ma ebe otutu umu nwoke n’etoliteghi na ha ibu ndi nna, odi nkpa icho nduzi - site na Akwukwo Nso na site na ndi nna. Amamihe Omimi bụ njem iji wee nweta amamihe na nghọta maka ndị nna, na-ejikọta ụkpụrụ na amamihe site na Akwụkwọ Nsọ na ahụmịhe nke nna ochie, mara ihe nke amụtara site na mmejọ ya. Ọnọdụ.
Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka Ọbụla
Ụbọchị Iri ato
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.