Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara I. PITA 5:7

Kulie, Jìrí Obi Ike Gaa Ihu Na Ndụ
Ụbọchị Atọ
Ọ bụrụ na olu gasị nke enweghị nchebe, obi abụọ, na egwù abụghị nke e cherè ihu, ha ga-achị ndụ gị. Ị nweghị ike imechi olu ha ma ọ bụ leghara ha anya. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ, Sarah Jakes Roberts na-egosi gị otu ị ga-esi kuchie ọnụ mgbochi gasị nke si na ndụ gị gara aga wee nabata ihe ndị ahụ dịka ha dị nsogbu ka ị wee bụrụ onye ihe ọbụla n'apụghị ịkwụsị.

Jizọs, Achọrọ M Gị!
Ụbọchị Atọ
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.

Wepụ ihe gbasara gị
3 Ụbọchị
Echiche nke Oziọma nke 1 Pita 5. Chineke dịka Nna anyị kpọworo anyị n'ịchịli aka elu, Ọ kpọrọ ụmụ Ya niile ka ha tụkwasị ya ibu ha.

Afọ Ọhụrụ: Mmalite Ọhụrụ
Ụbọchị Ise
Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!

N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa
Ụbọchi Asaa
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!

Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

Dị̀ Nchegbu N'efu
Ụbọchị asaa
Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na e nwerè ụzọ ka mma ịlụso nchegbu n'adịghị agwụ agwụ n'eme ka ị ghara ihi ụra n'abalị, ọgụ̀? Ezi ezumike dị—ma nwee ike dị nso karịa ka ị cherè. Jiri udo dochie ụjọ site ná atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa sitere na Life.Church, na-esote usoro ozi Pastọ Craig Groeschel bụ́ Dị̀ Nchegbu N'efu.