Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara I. JỌN 3:1

Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla
Ụbọchị Ise
Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.