1
Jenesis 7:1
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Mgbe ụbọchị ahụ zuru, ONYENWE ANYị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
Bandingkan
Telusuri Jenesis 7:1
2
Jenesis 7:24
Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
Telusuri Jenesis 7:24
3
Jenesis 7:11
Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
Telusuri Jenesis 7:11
4
Jenesis 7:23
Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
Telusuri Jenesis 7:23
5
Jenesis 7:12
Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Telusuri Jenesis 7:12
Beranda
Alkitab
Rencana
Video