ONYENWE ANYị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.
“Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide,
oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi,
oge oyi na oge okpomọkụ,
ọkọchị na udu mmiri,
ehihie na abalị,
agaghị ebi.”