YouVersion Logo
Search Icon

MAK 14

14
1Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n'aghughọ, b͕ue Ya: 2n'ihi na ha nāsi, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù ndi-Ju we ghara idi ma eleghi anya.
3Mb͕e Ọ nọ na Betani n'ulo Saimon onye-ekpenta, mb͕e Ọ nānọdu na nri, otù nwanyi we bia nke nēji ite alabaster, nke manu-otite ezi nard di oké ọnu-ahia nke-uku di ya; ọ kuwara ite ahu, we wusa manu-otite ahu n'isi-ya. 4Ma ufọdu di ndi iwe nēwe nke-uku n'etiti ha, ha si, Àlawo manu-otite a n'iyì otú a iji me gini? 5N'ihi na apuru ire manu-otite a kari ọgu shilling iri-na-ise, we nye ndi-ob͕enye. Ha we tamu ntamu megide nwanyi ahu. 6Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum. 7N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. 8O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì. 9Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
10Judas Iskariot, onye nke bu otù nime ndi-ozi iri na abua ahu, we jekuru ndi-isi-nchu-àjà, ka o we rara Ya nye n'aka-ha. 11Ma mb͕e ha nuru ya ha ṅuria ọṅu, we kwe nkwa inye ya ego. Ọ we nāchọ oghere o gēsi rara Ya nye.
12N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga? 13O we zipu madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya; 14ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? 15Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n'ebe ahu dozienu ihe nye ayi. 16Ndi ahu nēso uzọ-Ya we pua ba n'obodo, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
17Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia. 18Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe. 19Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu? 20Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere. 21N'ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.
22Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum. 23O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya. 24O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu. 25N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.
26Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
27Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya. 28Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili. 29Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n'ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem. 30Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ. 31Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru.
32Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere. 33O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. 34O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche. 35O we ga n'iru nke-ntà, da n'ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me. 36O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ. 37O we bia, hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Saimon, ì nāraru ura? ì nweghi ike iche nche otù oge hour? 38Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. 39O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu. 40O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya. 41O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie. 42Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.
43Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ. 44Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je. 45Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. 46Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya. 47Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya. 48Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? 49Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 50Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.
51Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n'aru ọtọ ya: ha we jide ya: 52ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga.
53Ha we si n'ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n'ebe ọ nọ. 54Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku. 55Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi. 56N'ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù. 57Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si, 58Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me. 59Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù. 60Onye-isi-nchu-àjà we bilie n'etiti, jua Jisus, si, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? 61Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi? 62Jisus we si, Mu onwem bu Ya: unu gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa, Ya na igwe-oji nile nke elu-igwe. 63Onye-isi-nchu-àjà we dọwa uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? 64Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu. 65Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n'ipia Ya ihe.
66Mb͕e Pita nọ n'okpuru n'obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia: 67mb͕e ọ huru Pita ka ọ nānya ọku, o we le ya anya, si, Gi onwe-gi na Onye Nazaret ahu, bú Jisus, nọ-kwa-ra. 68Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n'uzọ-nbata. 69Nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, malite kwa ọzọ isi ndi guzoro nso, Nwoke a bu otù onye nime ha. 70Ma ọ gọ-kwa-ra ọzọ. Mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso we si kwa Pita ọzọ, N'ezie i bu otù onye nime ha; n'ihi na i bu kwa onye Galili. 71Ma ọ malitere idu ikwù, na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a Onye unu nēkwu. 72Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n'obì o we kwa ákwá.

Currently Selected:

MAK 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy