YouVersion Logo
Search Icon

JOEL 1

1
1Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti.
2Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n'ala nka. Nka, ọ̀ diwo n'ubọchi-unu? mà-ọbu n'ubọchi nna-unu-hà? 3Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ. 4Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo. 5Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu. 6N'ihi na otù mba arigokwasiwo n'alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum. 7O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha. 8Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n'ihi di o nwere na nwata. 9Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú. 10Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo. 11Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì. 12Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu. 13Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu. 14Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova. 15Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia. 16Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi? 17Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka. 18Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma. 19Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia. 20Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n'ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

Currently Selected:

JOEL 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy