YouVersion Logo
Search Icon

EZIKIEL 46

46
1Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche iru n'Iru-anyanwu gābu ihe emechiri emechi n'ubọchi ọlu isi unu; ma n'ubọchi-izu-ike ka agēmeghe ya, ọ bu kwa n'ubọchi nke ọnwa ọhu ka agēmeghe ya. 2Onye-isi gēsi kwa n'uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n'èzí bata, guzo n'akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi. 3Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ahu n'iru Jehova n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile. 4Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè; 5onyinye-inata-iru-ọma bu kwa otù ephah bayere ebulu ahu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye-inata-iru-ọma, bú onyinye nke aka-ya, ya na manu, otù hin diri otù ephah. 6Ma n'ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu: 7ọ bu kwa otù ephah etiyere n'oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n'ebulu ahu, na ihe etiyere n'umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma. 8Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua. 9Ma mb͕e ndi ala nka gābia n'iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu. 10Ma onye-isi, ọ bu n'etiti ha, mb͕e ha nābata, ka o gēso bata; ọzọ, mb͕e ha nāpu, ha gāpu n'otù. 11Ọzọ, n'ememe nile na nime mb͕e nile akara àkà onyinye-inata-iru-ọma gābu otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye aka-ya, na manu, otù hin otù ephah. 12Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri. 13Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya. 14I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi. 15Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile.
16Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e onye-isi gēnye onye ọ bula n'umu-ya ndikom onyinye, ihe-nketa-ya ka ọ bu, umu-ya ndikom gēnwe ya; ihe-onwunwe-ha ka ọ bu n'ihe-nketa. 17Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n'ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu. 18Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya.
19O we me ka m'si na nbata ahu nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama ahu bata n'ime-ulo nsọ nile nke ndi-nchu-àjà, nke nēche iru n'Ugwu; ma le, n'ebe ahu ka otù ebe di n'azu ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 20O we sim, Nka bu ebe ahu ebe ndi-nchu-àjà gēsi anu àjà-ikpe-ọmuma na anu àjà-nmehie, ebe ha gēsi onyinye-inata-iru-ọma; ka ha we ghara iweputa ha n'ogige di n'èzí, ido ndim nsọ. 21O we me ka m'puta ba n'ogige di n'èzí, o we me ka m'gabiga na nkuku anọ nke ogige ahu; ma, le, otù ogige di na nkuku ọ bula nke ogige ahu n'otù n'otù. 22Nime nkuku anọ nke ogige ahu ka ogige di nke ejikọtara ejikọta, ọgu cubit abua n'ogologo, orú cubit na iri n'obosara: otù ọtùtù diri ha anọ nime nkuku anọ ahu. 23Ọzọ, otù ariri ulo di buruburu nime ha, buruburu ha anọ, bú ulo ewuru nwere ebe-isi-ite n'okpuru ariri nile buruburu. 24O we sim, Ndia bu ulo nke ndi nēsi ite, ebe ndi-oje-ozi nke ulo a gēsi anu àjà ndi Israel.

Currently Selected:

EZIKIEL 46: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in