YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ NKE ABÙ 7

7
1Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya!
Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma,
Ọlu aka onye-ǹkà.
2Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu,
Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya:
Afọ-gi di ka obo ọka wheat
Nke eji urodi b͕a ya buruburu.
3Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua
Nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.
4Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;
Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;
Imi-gi di ka ulo-elu Lebanon
Nke chere Damaskọs iru.
5Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel,
Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo;
Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.
6Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku,
Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile!
7Ogologo-gi nka yiri nkwu,
Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.
8M'siri, M'gārigo elu nkwu,
M'gējide igu-ya aka:
Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine,
Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;
9Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma,
Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ,
Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.
10Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ,
N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.
11Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia;
Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.
12Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile;
Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru,
Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko:
N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.
13Mandrake nile nēsì ísì utọ,
Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie,
Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.

Currently Selected:

ABÙ NKE ABÙ 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in