YouVersion Logo
Search Icon

NDI ROM 9

9
1Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ, 2na enwerem oké ihe-nwuta na ihe-nb͕u nādighi-agwu n'obim. 3N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di: 4ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile; 5ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 6Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n'ala. N'ihi na ndi si n'Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel: 7ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha. 8Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru. 9N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. 10Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi- 11n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ, 12asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà. 13Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì.
14Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela. 15N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya. 16Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke. 17N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile. 18Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.
19Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere? 20Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a? 21Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere? 22Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì: 23ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube, 24bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ? 25Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si,
M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim;
M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.
26O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu,
N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.
27Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa: 28n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.
29Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue,
Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru,
Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.
30Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta: 31ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu. 32N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha; 33dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,
Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà:
Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.

Currently Selected:

NDI ROM 9: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in