YouVersion Logo
Search Icon

NDI ROM 14

14
1Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi. 2Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi. 3Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya. 4Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo. 5Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya. 6Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke. 7N'ihi na ọ dighi onye ọ bula n'etiti ayi nke di ndu n'ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n'ebe ya onwe-ya nọ. 8N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi. 9N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu. 10Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke. 11N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,
Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru,
Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke.
12Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.
13Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya. 14Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú. 15N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya. 16Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu: 17n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ. 18N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu. 19Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo. 20Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya. 21Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya. 22Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa. 23Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.

Currently Selected:

NDI ROM 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in