YouVersion Logo
Search Icon

NDI ROM 11

11
1Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta. 2Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si, 3Onye-nwe-ayi, ha b͕uru ndi-amuma-Gi, ha gwudara ebe-ichu-àjà-Gi nile: nání mu onwem fọdu-kwa-ra, ha nāchọ kwa ndum. 4Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal. 5Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di. 6Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a. 7Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili: 8dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta. 9Devid nāsi kwa,
Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà,
Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ:
10Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ,
Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.
11Ya mere m'nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo. 12Ma ọ buru na ndahie-ha bu àkù nke uwa, ọ buru kwa na ila-ala-ha bu àkù nke ndi mba ọzọ; òzùzù-ha gēsi aṅa ghara ibu kari àkù-ha nke-uku?
13Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto): 14ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha. 15N'ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n'otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu? 16Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ. 17Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu; 18anyalara alaka ahu isi: ma ọ buru na i nānyara ha isi, ọ bughi gi onwe-gi nēbu nkpọrọgwu, kama ọ bu nkpọrọgwu nēbu gi. 19Ya mere i gāsi, Anyakapuru alaka ufọdu ka ewe nyakudo mu onwem. 20Ọ di nma; n'ekweghi-ekwe-ha ka anyakapuru ha, ma gi onwe-gi nēguzo n'okwukwe-gi. Atukwasila uche-gi n'ihe di elu, kama nātu egwu: 21n'ihi na asi na Chineke emeghi alaka ahu osisi olive ji puta uwa ebere, Ọ gaghi-eme kwa gi ebere. 22Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n'aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n'aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n'obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a. 23Ndi ahu kwa, ma ọ buru na ha anọgideghi n'ekweghi-ekwe-ha, agānyakudo ha: n'ihi na Chineke puru inyakudo ha ọzọ. 24N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha?
25N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata; 26otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,
Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta;
Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:
27Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ,
Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.
28N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà. 29N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke. 30N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha, 31otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a. 32N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.
33A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile! 34N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù? 35ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ? 36N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Currently Selected:

NDI ROM 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in