YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 88

88
Abù, bú Abù Ọma Umu Kora; nke diri Onye-isi Abù; n'elu Mahalath Leannoth. Maschil Himan, bú onye-Ezrahait.
1Jehova, Chineke nke nzọputam,
N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:
2Kwe ka ekperem bata n'iru Gi;
Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:
3N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim,
Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.
4Aguwom na ndi nārida n'olùlù;
Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:
5Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya,
Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì,
Ndi I nēchetaghi ọzọ;
Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.
6I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala,
N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.
7Ọnuma-Gi akwagidewom,
I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah
8I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya;
I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú:
Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.
9Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala:
Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi,
Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.
10Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu?
Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah
11Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì?
Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?
12Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri?
Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?
13Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova,
Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.
14Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim?
N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?
15Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata:
Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.
16Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim;
Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.
17Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile;
Ha ab͕awom buruburu n'otù.
18I mewo ka onye nāhum n'anya na eyìm nọm n'ebe di anya,
Ndi m'mara nke-ọma ka ọchichiri bu.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 88: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in