YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 70

70
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid; ime ka echeta.
1Chineke, bia ọsọsọ inaputam;
Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.
2Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere,
Bú ndi nāchọ nkpuru-obim:
Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,
Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.
3Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha,
Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!
4Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi;
E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,
Ka Chineke di uku.
5Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye;
Chineke, biakutem ọsọsọ:
Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu;
Jehova, anọla ọdù.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 70: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in