YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 40

40
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Elesirim anya Jehova ike;
Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum.
2Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa;
Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike.
3Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi:
Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.
4Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya,
Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.
5Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile,
Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ:
Apughi idoro Gi ha n'usoro;
Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha,
Ha kariri igu-ọnu.
6Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;
Nti abua ka I ràpúworom:
Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.
7Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom;
N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:
8Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke;
Iwu-Gi di kwa nime obim.
9Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;
Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,
Jehova, Gi onwe-gi amawo.
10Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim;
Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi:
Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi
11Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile:
Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.
12N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,
Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;
Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.
13Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam:
Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.
14Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù,
Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya:
Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,
Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.
15Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha,
Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.
16Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi:
Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,
Ka Jehova di uku.
17Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye;
Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè:
Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu;
Chimekem, anọla ọdù.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 40: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy