YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 31

31
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi:
N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu.
2Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa:
Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.
3N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;
Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.
4I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta;
N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.
5N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe:
I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.
6Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:
Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.
7Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:
N'ihi na I huwo nweda-n'alam;
I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:
8I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;
I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.
9Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u:
Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.
10N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume:
Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.
11N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,
Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu:
Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.
12Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu:
Aghọwom ihe nāla n'iyì.
13N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,
Ujọ dim buruburu:
Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem,
Ha zubere iwepu ndum.
14Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova:
Asiwom, Chinekem ka I bu.
15N'aka-Gi ka mb͕em nile di:
Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.
16Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:
Zọputam n'ihi ebere-Gi.
17Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I:
Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ.
18Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;
Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,
Nime npako na nleda-anya.
19Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,
Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!
20I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu:
I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.
21Onye agọziri agọzi ka Jehova bu:
N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike.
22Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi:
Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.
23Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile:
Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi,
Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.
24Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 31: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in