YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 23

23
Abù Ọma Devid.
1Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.
2N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu:
N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.
3Ọ nēweghachi nkpuru-obim:
Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.
4Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu,
M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem:
Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.
5I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um:
I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.
6Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum:
M'gēbi kwa n'ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in