YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 20

20
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Jehova za gi n'ubọchi nkpà,
Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu;
2Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi,
Si kwa na Zaion kwagide gi;
3Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma,
Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah
4Ya nye gi dika obi-gi si acho,
Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.
5Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi,
Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu:
Jehova mezue aririọ-gi nile.
6Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;
O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya
Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.
7Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:
Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
8Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:
Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.
9Jehova, zọputa eze:
Ya za ayi n'ubọchi ayi kpọkuru Ya.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 20: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in