YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 18

18
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid, onye gwara Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile, na n'ọbu-aka Sol: o we si,
1Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.
2Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu;
Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;
Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.
3Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:
Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
4Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,
Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.
5Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu:
Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.
6Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,
Ọ bu Chinekem ka m'nētiku:
O nēsi n'ulo uku Ya nu olum,
Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.
7Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,
Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,
Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
8Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,
Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:
Afunwuru icheku site na ya.
9O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;
Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.
10O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie:
O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.
11Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;
Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
12Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,
Akú-miri-ígwé na icheku ọku.
13Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe,
Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;
Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.
14O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;
Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.
15Ewe hu ebe nile miri si erù,
Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,
Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova,
Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.
16O si n'elu zìe, kurum,
Dọputam n'ọtutu miri.
17Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,
Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.
18Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:
Ma Jehova burum ihe-ndabere.
19O we me ka m'puta rue ebe sara mbara;
Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
20Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;
Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.
21N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,
Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.
22N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,
Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.
23M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,
Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.
24Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,
Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.
25N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;
N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
26N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;
Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.
27N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala;
Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.
28N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:
Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
29N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;
Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.
30Chineke, uzọ-Ya zuru okè:
Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;
Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
31N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?
Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
32Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,
Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
33O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:
N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.
34O nēzi akam abua ibu agha;
Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
35I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:
Aka-nri-Gi nākwagidekwam,
Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
36I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,
Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
37Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:
Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
38Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:
Ha nāda n'okpuru ukwum abua.
39I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:
I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
40Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha
Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
41Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:
Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.
42Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:
Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.
43I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;
I nēdom onye-isi mba nile ọzọ
Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
44Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:
Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.
45Ndi ala ọzọ nāta aru,
Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
46Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;
Chineke nke nzọputam di kwa elu:
47Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,
We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.
48Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom:
I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:
I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.
49N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile,
Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
50Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku;
Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,
Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in