YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 15

15
Abù Ọma Devid.
1Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n'ulo-ikwu-Gi?
Ònye gēbi n'ugwu nsọ Gi?
2Onye nēje ije n'izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume,
Nke nēkwu kwa ezi-okwu n'obi-ya.
3O jighi ire-ya kwue okwu-azu,
Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ,
O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya.
4Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya,
Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu.
Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.
5Ọ nyeghi ego-ya inara uma,
Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ.
Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 15: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in