YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 142

142
Maschil Devid, mb͕e ọ nọ n'ọb͕a; ekpere.
1Olum ka m'ji etiku Jehova;
Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara.
2Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya;
Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya.
3Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm.
N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.
4Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam:
Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.
5Etikurum I, Jehova;
Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm,
Na òkèm n'ala ndi di ndu.
6Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli:
Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.
7Me ka nkpuru-obim si n'ebe emechibidoworo ya puta, ka m'we kele aha-Gi:
Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu;
N'ihi na I nēmesom nke-ọma.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 142: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in