YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 139

139
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram.
2Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm,
I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.
3Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka,
Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.
4N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem,
Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.
5N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.
6Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube;
Ọ dika elu, apughm iru ya.
7Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi?
Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?
8Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ:
Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.
9Ọ buru na achirim nkù nke ututu,
Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,
10Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,
Aka-nri-gi gējidekwam.
11M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim;
Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.
12Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi;
Ma abali nēnye ìhè dika ehihie:
Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi
13N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua:
I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.
14M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu:
Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di;
Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.
15Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi,
Mb͕e emerem na nzuzo,
Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.
16Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè,
Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru,
Nke akpuru kwa-ubọchi,
Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.
17Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke!
Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!
18Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá:
Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide.
19Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke:
Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu.
20Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ,
Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.
21Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì?
Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi?
22Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì:
Ndi-iro ka ha burum.
23Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim:
Nānwam, we mara iche-uchem nile:
24Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem,
Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 139: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in