YouVersion Logo
Search Icon

ILU 3

3
1Nwam, echezọla iwum;
Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:
2N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,
Na udo, ka ha gātukwasiri gi.
3Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:
Ke ha n'olu-gi;
De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:
4Chọta kwa amara na ezi uche
N'anya Chineke na madu.
5Tukwasi Jehova obi-gi nile,
Adabere-kwa-la nghọta-gi:
6N'uzọ-gi nile mara Ya,
Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.
7Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi;
Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:
8Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,
Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.
9Sọpuru Jehova site n'àkù-gi,
Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:
10Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,
Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.
11Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:
Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:
12N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;
Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
13Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,
Ya na madu nke nēnweputa nghọta.
14N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,
Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.
15Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:
Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.
16Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;
N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.
17Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,
Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.
18Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:
E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.
19Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;
O doziri elu-igwe site na nghọta.
20Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,
Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.
21Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;
Chebe nzube-ihe na ìzùzù;
22Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,
Bu-kwa-ra olu-gi amara.
23Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,
I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,
24Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:
E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
25Atula egwu site n'oké egwu mberede,
Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:
26N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,
Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.
27Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,
Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.
28Asila madu-ibe-gi, Je, lata,
Echi ka m'gēnye gi;
Mb͕e ọ di n'aka-gi.
29Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,
Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.
30Gi na madu esela okwu n'efu,
Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.
31Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,
Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.
32N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:
Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.
33Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;
Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.
34Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,
Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.
35Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;
Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

Currently Selected:

ILU 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy