YouVersion Logo
Search Icon

ILU 1

1
1Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:
2Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;
Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;
3Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,
Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;
4Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,
Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:
5Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya;
Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:
6Ighọta ilu, na okwu miri emi;
Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.
7Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:
Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.
8Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,
Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
9N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,
Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.
10Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,
Ekwela.
11Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,
Ka ayi che anwu ọbara,
Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;
12Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,
Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;
13Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,
Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;
14Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;
Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:
15Nwam, esola ha je n'uzọ;
B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:
16N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,
Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.
17N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,
N'anya nnunu ọ bula:
18Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,
Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.
19Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;
Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.
20Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;
N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;
21N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;
N'oghere ọnu-uzọ-ama nile,
N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:
22Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya?
Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?
Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?
23Laghachinu n'iba-nbam:
Le, m'gāwupuru unu mọm,
M'gēme ka unu mara okwum nile.
24N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju;
Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;
25Unu we wezuga ndum-ọdum nile,
Unu achọghi kwa iba-nbam:
26Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì;
M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;
27Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike,
Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe;
Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.
28Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza;
Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:
29N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì,
Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:
30Ha achọghi ndum-ọdum;
Ha lelìri iba-nbam nile:
31Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha,
Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.
32N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha,
Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì.
33Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi,
Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.

Currently Selected:

ILU 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy