YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 33

33
1Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron. 2Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di. 3Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile, 4mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe. 5Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot. 6Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara. 7Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol. 8Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara. 9Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu. 10Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie. 11Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin. 12Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka. 13Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush. 14Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu. 15Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai. 16Ha si n'ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava. 17Ha si na Kibrot-hataava bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hazerot. 18Ha si na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Ritma. 19Ha si na Ritma bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Rimon-perez. 20Ha si na Rimon-perez bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Libna. 21Ha si na Libna bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Risa. 22Ha si na Risa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kehilata. 23Ha si na Kehilata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Shefa. 24Ha si n'ugwu Shefa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Harada. 25Ha si na Harada bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Makhilot. 26Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat. 27Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera. 28Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka. 29Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona. 30Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot. 31Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan. 32Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad. 33Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata. 34Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona. 35Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba. 36Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh). 37Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom. 38Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu. 39Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa. 40Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo. 41Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona. 42Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon. 43Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. 44Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab. 45Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad. 46Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim. 47Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo. 48Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko. 49Ha ma ulo-ikwū-ha n'akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n'ala ihe nādighi nke Moab.
50Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, 51Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean, 52unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu. 53Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya. 54Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa. 55Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya. 56O gēru kwa, na dika M'chère ime ha, otú a ka M'gēme unu.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 33: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in