ỌNU-ỌGUGU 20
20
1Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n'ọzara Zin n'ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n'ebe ahu, ewe lìe ya n'ebe ahu. 2Ma ọ dighi miri nzukọ ahu nwere: ha we kpọkọta onwe-ha megide Moses, megide kwa Eron. 3Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n'iru Jehova! 4Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n'ọzara nka, inwu n'ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi? 5Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n'ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu. 6Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya. 7Jehova we gwa Moses okwu, si, 8Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri. 9Moses we si n'iru Jehova were nkpa-n'aka ahu, dika O nyere ya iwu. 10Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu? 11Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha. 12Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha. 13Ndia bu miri Meriba; n'ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha.
14Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi: 15na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà: 16ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi: 17biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi. 18Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi. 19Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ. 20O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya. 21Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n'ókè-ala-ya: Israel we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.
22Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa. 23Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ugwu Hoa, n'akuku ókè ala Edom si, 24Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba. 25Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n'ugwu Hoa: 26i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu. 27Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n'ugwu Hoa n'anya nzukọ Israel nile. 28Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n'ebe ahu n'elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n'ugwu ahu ridata. 29Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.
Currently Selected:
ỌNU-ỌGUGU 20: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.