YouVersion Logo
Search Icon

NEHEMAIA 7

7
1O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha, 2na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu. 3M'we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya. 4Ma obodo ahu sara mbara n'aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n'etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu. 5Chinekem we tiye ya n'obim, m'we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu. M'we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m'we hu ihe a edeworo nime ya: 6Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya; 7ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel: 8Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua. 9Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua. 10Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 11Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ. 12Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 13Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise. 14Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ. 15Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ. 16Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ. 17Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua. 18Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa. 19Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa. 20Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise. 21Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ. 22Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ. 23Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ. 24Umu Harif, ọgu ise na iri na abua. 25Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise. 26Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ. 27Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ. 28Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua. 29Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ. 30Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù. 31Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua. 32Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ. 33Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua. 34Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 35Umu Harim, ọgu iri-na-isi. 36Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise. 37Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n' ọgu na iri-na-isi na otù. 38Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri. 39Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ. 40Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 41Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa. 42Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa. 43Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ. 44Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ. 45Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ. 46Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot; 47na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon; 48na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai; 49na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha; 50na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda; 51na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea; 52na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim; 53na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua; 54na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha; 55na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema; 56na umu Nezia, na umu Hatifa. 57Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida; 58na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel; 59na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon. 60Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua. 61Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta: 62umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua. 63Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha. 64Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà. 65Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo. 66Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ, 67nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù. 68Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise; 69camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi. 70Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n'ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri. 71Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri. 72Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa. 73Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.

Currently Selected:

NEHEMAIA 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in