NEHUM 1
1
1Ibu eboro Nineve. Akwukwọ ọkù nke Nehum, bú onye Elkosh.
2Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu. 3Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua. 4Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa. 5Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n'iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya. 6Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya. 7Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya. 8Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri. 9Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua. 10N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu. 11Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya. 12Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ. 13Ma ub͕u a ka M'gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibi. 14Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya. 15Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.
Currently Selected:
NEHUM 1: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.