YouVersion Logo
Search Icon

MAK 5

5
1Ha we bia rue ofè ọzọ nke oké osimiri ahu, n'ala ndi Gerasa. 2Mbe Ọ putasiri n'ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we si n'ebe anēlì ozu zute Ya, 3nwoke ahu nwere ebe-obibi-ya n'ebe ahu anēlì ozu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru ike ya ab͕u ọzọ, ọbuná ma ewere nkpọrọ; 4n'ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya. 5Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n'ebe anēlì ozu na n'ugwu. 6Mb͕e ọ huru Jisus n'ebe di anya, o we b͕a ọsọ, kpọ isi ala nye Ya; 7mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru. 8N'ihi na Ọ nāsi ya, Si nime nwoke a puta, gi mọ nādighi ọcha. 9O we jua ya, Òle aha-gi? Ọ si Ya, Aham bu Legion; n'ihi na ayi di ọtutu. 10Ọ we riọsie Ya ike ka Ọ ghara izipu ha n'ala ahu. 11Ma oké ìgwè ezì di n'ebe ahu na nso ugwu ahu nāta nri. 12Ha we riọ Ya, si, Ziga ayi nime ìgwè ezì ahu, ka ayi we ba nime ha. 13O we kwere ha. Ndi-mọ ahu nādighi ọcha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ìgwè ezì we nudà n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, ha ruru dika nnù ise; miri we b͕ab͕ue ha. 14Ndi nāzù ha we b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na n'ubi. Ha we bia ihu ihe ọ bu, bú nke emereri. 15Ha we biakute Jisus, le onye ahu ndi-mọ ọjọ ji ka ọ nọduru ala, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè, bú onye nwere legion ahu: ha we tua egwu. 16Ndi huru ya we kọrọ ha otú emere onye ahu ndi-mọ ọjọ ji, na okwu ìgwè ezì ahu. 17Ha we malite iriọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha. 18Mb͕e Ọ nābà nime ub͕ọ, onye ahu ndi-mọ ọjọ jiri na mbu we riọ Ya ka ya na Ya biri. 19Ma O kweghi ya, kama Ọ si ya, La n'ulo-gi, lakuru ndi nke gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Onye-nwe-ayí meworo gi, na otú O mere gi ebere. 20O we je, malite ikwusa na Dekapọlis ihe Jisus mere ya, ka ha ra: o we ju madu nile anya.
21Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri. 22Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya, 23we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu. 24O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya.
25Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, 26nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ, 27ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka. 28N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. 29Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu. 30Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka? 31Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka? 32O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a. 33Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile. 34Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.
35Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa? 36Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání. 37O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes. 38Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku. 39Mb͕e Ọ batasiri, O we si ha, Gini mere unu nātu ùzù, nākwa kwa ákwá? nwatakiri ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. 40Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e Ọ chupusiri ha nile, Ọ kuru nna nwatakiri ahu na nne-ya na ndi Ya na ha yikọ, we ba n'ebe nwatakiri ahu di. 41O we jide nwatakiri ahu n'aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie. 42Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n'ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n'aru 43O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.

Currently Selected:

MAK 5: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in