YouVersion Logo
Search Icon

MATIU 22

22
1Jisus we za, gwa ha okwu ọzọ n'ilu, si, 2Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke, 3zipu kwa ndi-orù-ya ikpọ ndi akpọrọri ibia n'oriri ọlulu-nwunye ahu: ma ha achọghi ibia. 4Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n'oriri ọlulu-nwunye nkem. 5Ma ha lefuru ya anya, je ebe nke ha, otù onye n'ubi nke aka ya, nke-ọzọ n'ihe-ahia-ya: 6ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha. 7Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku. 8Mb͕e ahu ọ si ndi-orù-ya, Edozisiwo ọlulu-nwunye nkem, ma ndi akpọrọri ekwesighi. 9Ya mere, ganu n'ab͕ata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n'oriri ọlulu-nwunye nkem. 10Ndi-orù ahu we pua ga n'uzọ nile, me ka madu nile ha huru zukọ, ka ha ra, ma ajọ madu ma ezi madu: ulo anālu nwunye we juputa na ndi nọduru na nri. 11Ma mb͕e eze ahu batara ikiri ndi nọduru na nri, ọ hu n'ebe ahu otù nwoke nke nēyighi uwe ọlulu-nwunye: 12o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n'ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu. 13Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 14N'ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole.
15Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n'ọnyà n'okwu. 16Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru. 17Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi? 18Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua? 19Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling. 20Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? 21Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. 22Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.
23N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya, 24si, Onye-ozizí, Moses siri, Ọ buru na nwoke anwua, nēnweghi umu, nwa-nne-ya nwoke gālu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe nwunye-ya nọ, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 25Ma umu-nne-ndikom asa di n'etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya; 26otú a ka nke-abua me-kwa-ra, nke-atọ kwa, rue nke-asa. 27Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwu-kwa-ra. 28Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha asa ka ọ gābu? n'ihi na ha nile nwere ya na nwunye. 29Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke. 30N'ihi na nime nbilite-n'ọnwu ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di, kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. 31Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si, 32Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu. 33Ma mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ibobo ozizí-Ya nwuru ha n'aru.
34Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe. 35Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya, 36si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi? 37Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya. 38Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu. 39Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 40Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
41Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha, 42si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid. 43Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,
44Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua?
45Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya? 46Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.

Currently Selected:

MATIU 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in