YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ-ÁKWÁ 4

4
1Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe!
Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n'isi èzí nile ọ bula.
2Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha,
Le otú aguworo ha n'ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!
3Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara:
Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.
4Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku:
Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.
5Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n'efu n'èzí nile:
Ndi azùputaworo n'uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.
6Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,
Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.
7Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,
Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.
8Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí:
Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.
9Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;
N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.
10Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite;
Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.
11Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;
O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.
12Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,
Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.
13O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,
Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.
14Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,
Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.
15Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:
Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.
16Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:
Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.
17Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi:
N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.
18Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi;
Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.
19Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe:
N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.
20Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha;
Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.
21Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz:
Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.
22Ajọ omume-gi agwusiwo, gi ada Zaion;
Ọ gaghi-eme kwa ọzọ ka i je biri n'ala ọzọ:
Ọ gēleta ajọ omume-gi, gi ada Edom;
Ọ gēkpughe nmehie-gi nile.

Currently Selected:

ABÙ-ÁKWÁ 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in