YouVersion Logo
Search Icon

JONA 2

2
1Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere. 2O we si,
Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova,
O we zam;
N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya,
I nuru olum.
3N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile,
Osimiri dikwam buruburu;
Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.
4Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua;
Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.
5Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi;
Ob͕u-miri dim buruburu;
Achara-miri kukurum n'isi.
6Rue ala ugwu nile ka m'ridara;
Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi:
Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.
7Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara:
Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.
8Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama,
Ebere-ha ka ha nārapu.
9Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà;
Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi.
Nzọputa diri Jehova.
10Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.

Currently Selected:

JONA 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in