YouVersion Logo
Search Icon

JOB 7

7
1Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa?
Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?
2Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò,
Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:
3Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,
Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.
4Ọ buru na edinam, m'si,
Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;
Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.
5Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;
Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.
6Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,
Ha we gwusia nenweghi olile-anya.
7Cheta na ndum bu ifufe:
Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.
8Anya onye nāhum agaghi-ekirim:
Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
9Dika igwe-oji si agwusi, we la,
Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.
10Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,
Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.
11Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;
Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;
Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
12Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,
Na I nēdo ndi-nche ichem?
13Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,
Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14I we were nrọ me ka m'tua ujọ,
I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,
Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
16Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:
Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.
17Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,
Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,
18Na I nēleta kwa ya ututu nile,
Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?
19Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya,
Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?
20Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu?
N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ,
M'we ghọrọ onwem ibu?
21Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga?
N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá:
I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.

Currently Selected:

JOB 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in