YouVersion Logo
Search Icon

JOB 36

36
1Elaihu we nēkwu kwa, si,
2Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi;
N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.
3M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem,
Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.
4N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:
Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.
5Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:
Ọ di ike n'ike nke obi.
6Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:
Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.
7Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:
Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-eze
Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.
8Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,
Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;
9O we nēgosi ha ọlu-ha,
Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.
10O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,
Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.
11Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,
Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma,
Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.
12Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha,
Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.
13Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi:
Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.
14Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,
Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.
15Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya.
Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.
16Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕u
Ba n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;
Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.
17Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:
Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.
18N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe;
Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.
19Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?
Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?
20Ekusila ume ike ibiaru abali,
Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.
21Lezie anya, echela ajọ ihe iru:
N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.
22Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:
Ònye bu onye-ozizí dika Ya?
23Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?
Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?
24Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,
Bú nke madu bùworo abù bayere ya.
25Madu nile elewo ya anya;
Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.
26Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;
Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.
27N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,
Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:
28Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.
29Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-oji
Nbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?
30Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;
Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.
31N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;
Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.
32Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;
We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.
33Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya,
Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

Currently Selected:

JOB 36: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in