YouVersion Logo
Search Icon

JOB 30

30
1Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim,
Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.
2Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram?
Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.
3N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:
Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.
4Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;
Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.
5Anēsi n'etiti madu chupu ha;
Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.
6N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,
Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.
7N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;
N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.
8Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;
Apiapuwo ha n'ala.
9Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,
M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.
10Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ,
Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.
11N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,
Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;
Ukwum abua ka ha nupuworo,
We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13Ha emebiwo uzọm,
Ha bara nmebim urù,
Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.
14Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:
N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.
15Ihe-egwu echighariwo imegidem,
Ha nāchu ọkakam dika ifufe;
Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.
16Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;
Ubọchi nweda-n'ala nējidem.
17N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,
Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.
18Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:
Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.
19Ọ tubàwom n'apiti,
M'we yie ájá na ntu.
20Anametiku Gi, ma I dighi-azam:
Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:
I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,
I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.
23N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,
Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.
24N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;
Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.
25Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike?
Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?
26Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra;
M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.
27Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū;
Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum.
28Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya:
Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke.
29M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne,
Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.
30Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum,
Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku.
31Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú,
Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.

Currently Selected:

JOB 30: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in