YouVersion Logo
Search Icon

JOB 18

18
1Bildad, bú onye Shua, we za, si,
2Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?
Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.
3Gini mere aguworo ayi ka anumanu?
Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.
4Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.
Àgārapu uwa n'ihi gi?
Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,
Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,
Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,
Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,
Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,
Ọnyà gāma ya.
10Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,
Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,
Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12Agu ganāgu ume-ya,
Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.
13Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,
Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;
Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:
Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,
Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,
Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,
Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,
Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,
Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.
21Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume,
Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.

Currently Selected:

JOB 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in