YouVersion Logo
Search Icon

JOB 16

16
1Job we za, si,
2Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia:
Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.
3Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu?
Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?
4Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu;
Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim,
M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu,
Na ifufe isim imegide unu.
5M'gēwere ọnum b͕a unu ume,
Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.
6Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:
Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?
7Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:
I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.
8I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem:
Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru.
9Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì;
Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya:
Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.
10Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum,
Were ita-uta tiem aka na ǹtì:
Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.
11Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume,
N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.
12Anọm n'udo, O we mebiem;
Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam,
Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.
13Àkú-Ya nile dim buruburu,
Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum;
Ọ nāwusi òlùlùm n'ala.
14O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya;
Ọ nāb͕akwasim dika dike.
15Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum,
Turughari mpim n'ájá.
16Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá,
Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;
17Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam,
Ekperem di kwa ọcha.
18Ala, ekpuchila ọbaram,
Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
19Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,
Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.
20Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:
Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;
21Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,
Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.
22N'ihi na arọ ole-na-ole gābia,
M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.

Currently Selected:

JOB 16: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in