YouVersion Logo
Search Icon

JOB 14

14
1Madu nke nwayi muru,
Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.
2Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya:
O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.
3Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi,
Me ka m'so Gi ba n'ikpé?
4Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.
5Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,
I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;
6Lepu ya anya, ka o we kwusi,
Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.
7N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,
Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.
8Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,
Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;
9Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,
Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.
10Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:
Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?
11Miri esiwo n'oké osimiri la,
Osimiri we tasia, takọrọ;
12Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:
Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,
Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.
13Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ,
Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,
Ma asi na I kparam ókè, we chetam!
14Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?
Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,
Rue mb͕e nb͕anwem gābia.
15I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:
Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.
16N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:
Ì dighi-elezi nmehiem anya?
17Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà,
I we tekpue ajọ omumem ihe.
18Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì,
Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya.
19Miri nēme ka nkume ta;
Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:
Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.
20I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;
I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.
21Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;
Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.
22Nání na o nēb͕u anu-aru-ya nke dikwasi ya nb͕u,
Nkpuru-obi-ya nke di nime aru-ya nēru kwa újú.

Currently Selected:

JOB 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in