YouVersion Logo
Search Icon

JEREMAIA 3

3
1Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 2Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala. 3Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere. 4Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu? 5Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.
6Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu. 7M'we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya. 8M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya. 9O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko. 10Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 11Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u. 12Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi. 13Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; n'ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M'gēwere kwa unu, otù site n'otù obodo, abua site n'otù ab͕uru, M'gēme kwa ka unu biarue Zaion: 15M'gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu. 16O gēru kwa, mb͕e unu baworo uba, mu kwa ọmùmù n'ala-unu, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi ọzọ, Ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; ọ gaghi-abà kwa n'obi: ha agaghi-echeta kwa ya; ha agaghi-eleta kwa ya; agaghi-eme kwa ya ọzọ. 17Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha. 18N'ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n'ala Ugwu rue ala ahu nke M'mere ka nna-unu-hà keta. 19Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu. 20N'ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 21Olu ka anuru n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n'ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha. 22Latanu, umu nke nādaghachi azu, M'gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi. 23N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di. 24Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom. 25Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.

Currently Selected:

JEREMAIA 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in