YouVersion Logo
Search Icon

JEREMAIA 21

21
1Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si, 2Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.
3Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia: 4Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a. 5Mu onwem gēbuso kwa unu agha n'aka eseteri eseti, na n'ogwe-aka di ike, ọbuná n'iwe, na n'ọnuma, na n'oké iwe. 6M'gētib͕u kwa ndi bi n'obodo a, ma madu ma anumanu: n'ajọ ọria uku nēfe efe ka ha gānwu. 7Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere. 8Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu. 9Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata. 10N'ihi na edowom irum n'aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n'ọku.
11Ma okwu bayere ulo eze Juda, nurunu okwu Jehova: 12unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n'ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu. 13Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n'ebe-obibi nile ayi? 14M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.

Currently Selected:

JEREMAIA 21: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in