YouVersion Logo
Search Icon

NDI-IKPE 4

4
1Umu Israel we me kwa ọzọ ihe ọjọ n'anya Jehova, mb͕e Ihud nwusiri. 2Jehova we renye ha n'aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ. 3Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.
4Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu. 5Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe. 6O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun? 7M'gadọ kwa Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Jebin, rue gi aru, rue mìri-iyi Kaishon, ya na ub͕ọ-ala-ya na ìgwè ndi-ya; M'gēnye kwa ya n'aka-gi. 8Berak we si ya, Ọ buru na i sorom je, m'gēje kwa: ma ọ buru na i soghm je, m'gaghi-eje. 9Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n'ije nke gi onwe-gi nēje; n'ihi na ọ bu n'aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh. 10Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo. 11Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh. 12Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa. 13Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon. 14Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu. 15Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya. 16Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.
17Ma Sisera b͕alagara n'ukwu-ya rue ulo-ikwū Jael, bú nwunye Heba onye-Kenait: n'ihi na udo di n'etiti Jebin, bú eze Hezoa, na ulo Heba, bú onye-Kenait. 18Jael we pua izute Sisera, si ya, Wezuga onwe-gi, onye-nwem, wezuga onwe-gi bakutem; atula egwu. O we wezuga onwe-ya bakuru ya n'ulo-ikwū, o were ákwà-ichu-oyi kpuchie ya. 19Ọ si ya, Biko, me ka m'ṅua nwantī miri; n'ihi na akpiri kpọrọm nku. O we meghe karama-akpukpọ miri-ara-ehi, me ka ọ ṅua, o kpuchie ya. 20Sisera we si ya, Guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, o gēru kwa, ọ buru na nwoke ọ bula abia, jua gi, si, Ọ̀ di nwoke ọ bula nọ n'ebe a? na i gāsi, É-è. 21Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n'aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n'akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n'ala; n'ihi na nwoke ahu di n'oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua. 22Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya. 23Chineke we me ka Jebin, bú eze Kenean, ruru ala ubọchi ahu n'iru umu Israel. 24Aka umu Israel we nāga nēsi ike n'aru Jebin, bú eze Kenean, rue mb͕e ha bipuru Jebin, bú eze Kenean.

Currently Selected:

NDI-IKPE 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in