YouVersion Logo
Search Icon

AISAIA 40

40
1Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi. 2Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.
3Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n'ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n'ala ihe nādighi. 4Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari: 5agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo. 6Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia: 7ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu. 8Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
9Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu! 10Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya. 11Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.
12Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù? 13Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe? 14Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n'okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta? 15Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe. 16Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku. 17Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya. 18Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ? 19Arusì apiri api, onye-ọ̀kà b͕azere ya, onye-nnucha-ọla nāmachita ya ọla-edo, ọ bu kwa iyab͕a ọla-ọcha ka ọ nākpuru ya. 20Onye dara ob͕eye kari ichu àjà-nbuli di otú a nārọputa osisi nke nādighi-ere ure; onye-ọ̀kà nke mara ihe ka ọ nāchọputara onwe-ya idozi arusi apiri api nke anāgaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. 21Ùnu amaghi? ùnu anughi? ègosighi unu ya site na mb͕e mbu? ùnu aghọtaghi site na ntọ-ala nile nke uwa? 22Ọ bu Onye ahu Nke nānọdu n'elu buruburu uwa, ndi bi nime ya ewe di ka ogugu; Nke nēseti elu-igwe dika ákwà di nfe, we b͕asa ha dika ulo-ikwū ibi ebi: 23Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n'efu. 24E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku. 25Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M'we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi. 26Welienu anya-unu elu, hu: ọ̀ bu Onye kère ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n'ọnu-ọgugu: ha nile n'aha-ha ka Ọ nākpọ; site n'iba-uba nke ike-Ya, na n'ihi na O nwere ume n'ike, ọ dighi ihe fọduru nke anāgughi.
27N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga? 28Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya. 29Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba. 30Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da: 31ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.

Currently Selected:

AISAIA 40: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in